16 E mesịa, o ji ọlaedo a na-agwaghị agwa mee arịa ndị dị n’elu tebụl ahụ, efere ya na iko ya na ọkwá ya na ihe mmiri ya ndị a ga-eji na-awụsa àjà ihe ọṅụṅụ.+
7 “Ha ga-ewerekwa ákwà na-acha anụnụ anụnụ sachie tebụl+ achịcha a na-eche n’ihu Chineke, ha ga-edokwasịkwa efere+ na iko na ọkwá,+ na ihe e ji awụsa àjà ihe ọṅụṅụ, n’elu ya; achịcha+ ahụ a na-edebe mgbe niile ga na-adị n’elu ya.