44 N’ihi na abụ m Jehova bụ́ Chineke unu;+ unu ga-edo onwe unu nsọ, unu ga-adịkwa nsọ,+ n’ihi na adị m nsọ.+ Ya mere, unu ejila ihe ọ bụla e kere eke na-enupụta n’ìgwè mee ka mkpụrụ obi unu ghara ịdị ọcha.
14 N’ihi na Jehova bụ́ Chineke gị na-ejegharị n’ebe ị mara ụlọikwuu ịnapụta gị+ na inyefe ndị iro gị n’aka gị;+ ebe ị mara ụlọikwuu ga-adịkwa nsọ,+ ka o wee ghara ịhụ ihe ọ bụla na-ekwesịghị ekwesị n’ahụ́ gị wee kwụsị iso gị.+