12 O wee gaa n’ihu ịsị: “Esetịla aka gị mee nwa okoro ahụ ihe, emekwala ya ihe ọ bụla ma ọlị,+ n’ihi na ugbu a ka m matara na ị na-atụ egwu Chineke n’ihi na ị jụghị inye m nwa gị nke ị mụrụ naanị ya.”+
31 Ya mere, ọgbakọ+ dị na Judia na Galili na Sameria dum banyere n’oge udo, e wee na-ewuli ya elu; ha nọgidekwara na-amụba ka ha na-eje ije n’egwu Jehova,+ na-adịkwa ndụ n’ụzọ kwekọrọ ná nkasi obi ha na-enweta site na mmụọ nsọ.+
4 Olee onye na-agaghị atụ egwu gị,+ Jehova,+ ma too aha gị,+ n’ihi na ọ bụ naanị gị na-eguzosi ike n’ihe?+ N’ihi na mba niile ga-abịa kpọọ isiala n’ihu gị,+ n’ihi na e mewo ka iwu ezi omume gị pụta ìhè.”+