13 Kwụsịnụ iwebata àjà ọka* na-abaghị uru.+ Ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ unu bụ ihe arụ n’anya m.+ Ụbọchị ememme ọnwa ọhụrụ+ na ụbọchị izu ike unu,+ ịkpọ òkù ka e nwee mgbakọ,+ apụghị m ịnabata ime anwansi+ nakwa nzukọ ukwu.
13 “Nke a bụ ihe nke abụọ unu na-eme, ọ na-akpata ịkwa ákwá na ịsụ ude, na-emekwa ka anya mmiri kpuchie ebe ịchụàjà Jehova, nke mere na a dịkwaghị anabata onyinye inweta ihu ọma, a dịghịkwa ele ihe ọ bụla si n’aka unu anya ọma.+