6 O wee gaa n’ihu ịsị: “Abụ m Chineke nke nna gị, Chineke Ebreham, Chineke Aịzik na Chineke Jekọb.”+ Mozis wee wepụ ihu ya, n’ihi na egwu tụrụ ya ile ezi Chineke anya.
13 Chineke Ebreham na nke Aịzik na nke Jekọb,+ ya bụ, Chineke nna nna anyị hà, emewo ka Ohu+ ya bụ́ Jizọs dị ebube,+ bụ́ onye unu onwe unu raara nye,+ gọnahụkwa ya n’ihu Paịlet, mgbe o kpebiri ịhapụ ya.+
16 Ma, ugbu a, ha na-achụso ebe ka mma, ya bụ, nke eluigwe.+ N’ihi ya, ihere ha adịghị eme Chineke, ka ha kpọkuo ya dị ka Chineke ha,+ n’ihi na ọ kwadebeworo ha otu obodo.+