15 Ị ga-eme ememme achịcha na-ekoghị eko.+ Ị ga-eri achịcha na-ekoghị eko+ ụbọchị asaa, dị nnọọ ka m nyere gị n’iwu, n’oge a kara aka n’ọnwa Ebib,+ n’ihi na ọ bụ na ya ka i si n’Ijipt pụta. Ọ dịghịkwa onye ga-agba aka bịa n’ihu m.+
12 N’ụbọchị mbụ nke ememme achịcha na-ekoghị eko,+ mgbe ha na-achụ anụ e ji eme ememme ngabiga n’àjà dị ka omenala ha si dị, ndị na-eso ụzọ ya+ sịrị ya: “Olee ebe ị chọrọ ka anyị gaa kwadebe ka ị nọrọ rie nri ememme ngabiga?”+