13 Ọ dịghị ọnwụnwa bịakwasịrị unu nke na-abụghị nke na-abịara ụmụ mmadụ.+ Ma Chineke kwesịrị ntụkwasị obi,+ ọ gaghịkwa ekwe ka a nwaa unu gabiga ihe unu pụrụ idi,+ kama mgbe ọnwụnwa bịara, ọ ga-emere unu ụzọ mgbapụ,+ ka unu wee nwee ike idi ya.
10 N’ihi na i debere okwu banyere ntachi obi m,+ m ga-echebekwa gị+ n’oge awa nke ule, bụ́ nke ga-abịakwasị elu ụwa dum mmadụ bi, iji lee ndị bi n’elu ụwa ule.+