29 Onye ọ bụla nke hapụworo ụlọ ma ọ bụ ụmụnne ndị ikom ma ọ bụ ụmụnne ndị inyom ma ọ bụ nna ma ọ bụ nne ma ọ bụ ụmụ ma ọ bụ ala n’ihi aha m ga-enweta ihe karịrị ya okpukpu okpukpu, ọ ga-eketakwa ndụ ebighị ebi.+
26 “Ọ bụrụ na onye ọ bụla abịakwute m ma ọ kpọghị nna ya na nne ya na nwunye ya na ụmụ ya na ụmụnne ya ndị ikom na ụmụnne ya ndị inyom asị, ee, kpọọkwa ọbụna mkpụrụ obi ya asị,+ ọ pụghị ịbụ onye na-eso ụzọ m.+