14 Ọ ga-aghọkwa ebe dị nsọ;+ ma ọ ga-aghọrọ ụlọ abụọ nke Izrel nkume ịkpọbi ụkwụ na oké nkume ịsụ ngọngọ,+ ghọọkwara ndị bi na Jeruselem+ igbudu na ọnyà.
3 Onye a ọ́ bụghị ọkwá nkà ahụ,+ nwa Meri+ nakwa nwanne Jems+ na Josef na Judas na Saịmọn?+ Ọ̀ bụkwa na anyị na ụmụnne ya ndị inyom anọghị n’ebe a?” Ha wee malite ịsụ ngọngọ n’ihi ya.+