15 “Nke a bụ ihe Jehova kwuru, ‘A na-anụ olu ákwá arịrị na ákwá dị ilu+ na Rema;+ Rechel+ na-akwara ụmụ ya ákwá.+ O kweghị ka a kasie ya obi n’ihi ụmụ ya,+ n’ihi na ha anọkwaghị.’”+
16 Nke a bụ ihe Jehova kwuru: “‘Ebezila ákwá, hichaa anya mmiri,+ n’ihi na ị ga-enweta ụgwọ ọrụ maka ọrụ gị,’ ka Jehova kwuru, ‘ha ga-esikwa n’ala ndị iro ha lọta.’+