5 Ndị isi+ nke ndị bụ́ nna ndị Juda na nke ndị Benjamin, tinyere ndị nchụàjà na ndị Livaị, wee bilie, ya bụ, ndị niile mmụọ+ nke ezi Chineke kpaliri, ka ha lawa gaa wughachi ụlọ Jehova,+ nke dị na Jeruselem.
17 “Ya mere, kwuo, sị, ‘Nke a bụ ihe Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru: “M ga-esikwa n’etiti ndị dị iche iche kpọkọta unu, sikwa n’ala dị iche iche a chụgara unu chịkọta unu, m ga-enyekwa unu ala Izrel.+
11 A ga-achịkọta ụmụ Juda na ụmụ Izrel ka ha dịrị n’otu,+ ha ga-eme otu onye onyeisi ha wee si n’ala ahụ pụọ,+ n’ihi na ụbọchị Jezril ga-abụ ụbọchị ukwu.+