2 Ndị Eze 4:44 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 44 O wee bute ya n’ihu ha, ha wee malite iri, ha rifọkwara ya dị ka Jehova kwuru.+ Mak 8:8 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 8 Ha wee rie ihe oriri, rijuo afọ, ha wee tụtụkọta ihe ha rifọrọ erifọ, o juru nkata asaa.+ Luk 9:17 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 17 Ha niile wee rie, rijuo afọ, a tụtụkọtakwara ihe ha rifọrọ, o wee ju nkata iri na abụọ.+ Jọn 6:12 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 12 Ma mgbe ha rijuru afọ,+ ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Tụtụkọtanụ ihe ha rifọrọ, ka ihe ọ bụla ghara ịla n’iyi.”
12 Ma mgbe ha rijuru afọ,+ ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Tụtụkọtanụ ihe ha rifọrọ, ka ihe ọ bụla ghara ịla n’iyi.”