16 Egwu+ wee jide ha niile, ha malitekwara inye Chineke otuto, na-asị: “E mewo ka onye amụma dị ukwuu+ bilie n’etiti anyị,” na-asịkwa, “Chineke echewo ihu ya n’ebe ndị ya nọ.”+
19 O wee sị ha: “Ihe ndị dị ka gịnị?” Ha wee sị ya: “Ihe mere Jizọs onye Nazaret,+ onye ghọrọ onye amụma+ dị ike n’ọrụ na n’okwu n’ihu Chineke na n’ihu mmadụ niile;