29 Ebe ọ bụ na onye Livaị+ enweghị òkè ma ọ bụ ihe nketa n’etiti unu, ya onwe ya na onye mbịarambịa+ na nwa na-enweghị nna na nwaanyị di ya nwụrụ,+ bụ́ ndị bi n’obodo gị, ga-abịa, ha ga-erikwa ihe wee rijuo afọ; ka Jehova bụ́ Chineke gị wee gọzie+ gị n’ihe niile ị ga-eji aka gị rụọ.+