10 ma, lee! e nwere otu nwoke aka ya kpọnwụrụ akpọnwụ!+ Ha wee jụọ ya, sị, “Iwu ọ̀ kwadoro ịgwọ ọrịa n’ụbọchị izu ike?” ka ha wee nweta ebubo ha ga-ebo ya.+
15 Otú ọ dị, Onyenwe anyị zara ya, sị: “Ndị ihu abụọ,+ ọ̀ dị onye ọ bụla n’ime unu nke na-adịghị atọpụ ehi ya ma ọ bụ ịnyịnya ibu ya n’ụlọ anụ n’ụbọchị izu ike ma kpụrụ ya gaa ka o nye ya mmiri?+
23 Ọ bụrụ na e bie mmadụ úgwù n’ụbọchị izu ike ka e wee ghara ịda iwu Mozis, ùnu na-eweso m iwe dị ọkụ n’ihi na e nwere onye m mere ka ahụ́ dịchaa mma n’ụbọchị izu ike?+