28 Ya mere, Jizọs sịrị: “Ozugbo unu buliri+ Nwa nke mmadụ+ elu, mgbe ahụ ka unu ga-amara na ọ bụ m bụ ya,+ na adịghịkwa m eme ihe ọ bụla n’uche nke aka m;+ kama m na-ekwu ihe ndị a dị nnọọ ka Nna m kụziiri m.+
10 Ọ̀ bụ na i kweghị na mụ na Nna m dị n’otu, na Nna m na mụ onwe m dịkwa n’otu?+ Adịghị m ekwu ihe m na-agwa unu n’echiche nke onwe m; kama ọ bụ Nna m nke mụ na ya dị n’otu na-arụ ọrụ ya.+
1Mkpughe+ nke si n’aka Jizọs Kraịst, nke Chineke kpugheere ya+ ka o gosi ndị ohu ya+ ihe ndị na-aghaghị ime n’oge na-adịghị anya.+ O wee ziga mmụọ ozi ya+ ma site n’aka ya gosi ya ohu ya bụ́ Jọn+ n’ụzọ ihe atụ,+