6 O wee sị: “Ọ bụghịrị gị obere ihe na ị ga-abụ ohu m iji mee ka ebo niile nke Jekọb bilie nakwa iji kpọghachite ndị Izrel e chebere echebe.+ Enyewokwa m gị ka ị bụrụ ìhè nke mba niile,+ ka nzọpụta m wee ruo nsọtụ ụwa.”+
35 Jizọs wee sị ha: “Ìhè ahụ ga-anọtụkwu nwa oge n’etiti unu. Na-ejegharịnụ mgbe unu nwere ìhè ahụ, ka ọchịchịrị+ wee ghara ikpuchi unu; onye na-ejegharị n’ọchịchịrị adịghịkwa ama ebe ọ na-aga.+