Matiu 12:24 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 24 Mgbe ndị Farisii nụrụ ihe a, ha sịrị: “Ọ dịghị ihe ọzọ onye a ji achụpụ ndị mmụọ ọjọọ ma ọ́ bụghị ike Bielzebọb, onye na-achị ndị mmụọ ọjọọ.”+ Jọn 7:20 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 20 Ìgwè mmadụ ahụ zara, sị: “Mmụọ ọjọọ ji gị.+ Ònye na-achọ igbu gị?” Jọn 10:20 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 20 Ọtụtụ n’ime ha nọ na-asị: “Mmụọ ọjọọ ji ya,+ ara na-agbakwa ya. Gịnị mere unu ji na-ege ya ntị?” Jọn 15:18 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 18 Ọ bụrụ na ụwa akpọọ unu asị, maranụ na ọ kpọwo m asị tupu ya akpọọ unu asị.+
24 Mgbe ndị Farisii nụrụ ihe a, ha sịrị: “Ọ dịghị ihe ọzọ onye a ji achụpụ ndị mmụọ ọjọọ ma ọ́ bụghị ike Bielzebọb, onye na-achị ndị mmụọ ọjọọ.”+