27 N’ihi na Nna m n’onwe ya hụrụ unu n’anya nke ukwuu, n’ihi na unu hụrụ m n’anya nke ukwuu,+ unu ekwerewokwa na m bịara dị ka onye nnọchiteanya nke Nna m.+
3N’ihi ya, ụmụnna m ndị dị nsọ, ndị so ná ndị a kpọrọ òkù ịga eluigwe,+ cheenụ echiche banyere onyeozi+ na nnukwu onye nchụàjà nke anyị na-ekwusa banyere ya,+ ya bụ, Jizọs.