29 Josef wee mee ka a kwadebe ụgbọ ịnyịnya ya, o wee gaa na Goshen+ izute Izrel nna ya. Mgbe o rutere n’ihu ya, ọ dakwasịrị ya n’olu ozugbo wee bee ákwá ugboro ugboro ka ọ dakwasịrị ya n’olu.+
5 Ị ga-ekwukwa n’ihu Jehova bụ́ Chineke gị, sị, ‘Nna m bụ onye Siria nke nọ na-ala n’iyi;+ o wee gbadaa Ijipt+ ma biri n’ebe ahụ dị ka ọbịa, ya na mmadụ ole na ole;+ ma n’ebe ahụ, ọ ghọrọ mba ukwu, nke dị ike ma dị ọtụtụ.+