41 Nke a mere ya afọ iri abụọ m biworo n’ụlọ gị. Ejeworo m gị ozi afọ iri na anọ maka ụmụ gị ndị inyom abụọ, jeekwa ozi afọ isii maka ìgwè anụ ụlọ gị, i wee na-agbanwe ụgwọ ọrụ m ruo ugboro iri.+
42 A sị na Chineke nke nna m,+ bụ́ Chineke Ebreham nakwa Onye Aịzik na-atụ egwu ya,+ anọnyereghị m, ị gaara agbawa m aka sị m lawa. Chineke ahụwo nhụjuanya m na ndọgbu aka m dọgbuworo onwe ya n’ọrụ, o wee baara gị mba n’abalị ụnyaahụ.”+