9 N’oge niile ha nọ na-ata ahụhụ, ọ nọ na-ewute ya.+ Onye ozi nke ya zọpụtara ha.+ Ọ gbapụtara ha n’ihi ịhụnanya na ọmịiko ya,+ o wee bulie ha, na-ekukwa ha ụbọchị niile kemgbe oge dị anya gara aga.+
19 N’ihi gịnịzi ka e ji nwee Iwu ahụ? A tụkwasịrị ya iji mee ka mmebi iwu pụta ìhè,+ ruo mgbe mkpụrụ ahụ ga-abịarute,+ bụ́ onye e kwere nkwa ahụ; e sitekwara n’aka ndị mmụọ ozi+ nye ya, site n’aka onye ogbugbo.+
2 N’ihi na ọ bụrụ na okwu ahụ e kwuru site n’ọnụ ndị mmụọ ozi+ guzosiri ike, ọ bụrụkwa na e nyere ntaramahụhụ maka mmebi iwu na omume nnupụisi ọ bụla dị ka ikpe ziri ezi si dị;+