26 M ga-emekwa ka i nwee ndị ikpe dị ka i nwere na mbụ, meekwa ka i nwee ndị ndụmọdụ dị ka i nwere ná mmalite.+ E mesịa, a ga na-akpọ gị Obodo Ezi Omume, Obodo Kwesịrị Ntụkwasị Obi.+
27 “‘E nyere ndị nsọ nke Onye Kasị Elu alaeze na ọchịchị na ebube nke alaeze ndị dị n’okpuru eluigwe dum.+ Alaeze ha bụ alaeze na-adịru mgbe ebighị ebi,+ ọchịchị niile ga-ejekwara ha ozi ma rubere ha isi.’+
21 Ma anyị nọ na-enwe olileanya na nwoke a bụ onye a kara aka ịnapụta Izrel;+ e wezụgakwa ihe ndị a niile, nke a bụ ụbọchị nke atọ kemgbe ihe ndị a mere.