5 Ma onye ọ bụla nke na-edebe okwu ya,+ n’eziokwu, ọ bụ n’ime ya ka e meworo ka ịhụnanya o nwere n’ebe Chineke nọ zuo okè.+ Anyị ji nke a mara na anyị na ya dị n’otu.+
6 Nke a bụkwa ihe ịhụnanya pụtara,+ ka anyị na-eje ije dị ka ihe ndị o nyere n’iwu si dị.+ Nke a bụ ihe ahụ e nyere n’iwu, dị nnọọ ka unu nụrụ site ná mmalite, na unu kwesịrị ịnọgide na-eje ije n’ime ya.+