2 Jọn
1 Mụ onwe m bụ́ okenye+ na-edegara nwaanyị ahụ a họọrọ+ akwụkwọ, tinyere ụmụ ya, bụ́ ndị m hụrụ n’anya n’ezie,+ ọ bụghị naanị m, kamakwa ndị niile mataworo eziokwu ahụ,+ 2 n’ihi eziokwu ahụ nke na-adịgide n’ime anyị,+ anyị ga-ejigidekwa ya ruo mgbe ebighị ebi.+ 3 Obiọma na-erughịrị mmadụ+ na ebere na udo nke si n’aka Chineke bụ́ Nna+ nakwa n’aka Jizọs Kraịst bụ́ Ọkpara nke Nna anyị ga-adịnyere anyị, tinyere eziokwu na ịhụnanya.+
4 M na-aṅụrị ọṅụ nke ukwuu n’ihi na ahụwo m ụfọdụ n’ime ụmụ gị+ ka ha na-eje ije n’eziokwu ahụ,+ dị nnọọ ka anyị natara iwu site n’aka Nna anyị.+ 5 Ya mere, nwaanyị, m na-edetara gị akwụkwọ, ka m rịọ gị ka anyị hụrịta ibe anyị n’anya,+ nke na-abụghị iwu ọhụrụ,+ kama ọ bụ nke anyị nwere site ná mmalite.+ 6 Nke a bụkwa ihe ịhụnanya pụtara,+ ka anyị na-eje ije dị ka ihe ndị o nyere n’iwu si dị.+ Nke a bụ ihe ahụ e nyere n’iwu, dị nnọọ ka unu nụrụ site ná mmalite, na unu kwesịrị ịnọgide na-eje ije n’ime ya.+ 7 N’ihi na ọtụtụ ndị nduhie abanyewo n’ụwa,+ bụ́ ndị na-adịghị ekwupụta na Jizọs Kraịst bịara n’anụ ahụ́.+ Nke a bụ onye nduhie ahụ+ na onye ahụ na-emegide Kraịst.+
8 Lezienụ anya ka ihe ndị anyị rụpụtara ghara ifunahụ unu, kama ka unu nweta ụgwọ ọrụ zuru ezu.+ 9 Onye ọ bụla nke na-agabiga+ ozizi nke Kraịst, nke na-adịghị anọgidekwa+ na ya enweghị Chineke.+ Ọ bụ onye nọgidere n’ozizi a nwere ma Nna ahụ ma Ọkpara ya.+ 10 Ọ bụrụ na onye ọ bụla abịakwute unu ma o wetaghị ozizi a, unu anabatala ya n’ebe obibi unu,+ unu ekelekwala ya.+ 11 N’ihi na onye kelere ya ekerewo òkè n’ajọ ọrụ ya.+
12 Ọ bụ ezie na m nwere ọtụtụ ihe idetara unu, achọghị m iji akwụkwọ na ink dee ya,+ kama m na-enwe olileanya ịbịakwute unu na iso unu kwurịta okwu ihu na ihu,+ ka ọṅụ unu+ wee zuo ezu.+