18 Ya mere, dị nnọọ ka a mara ụdị mmadụ niile ikpe site n’otu njehie,+ otú ahụkwa ka e si n’otu omume ziri ezi+ kpọọ ụdị mmadụ niile+ ndị ezi omume ka ha wee nweta ndụ.+
11 Ma nke ahụ bụkwa ihe ụfọdụ n’ime unu bụbu.+ Ma a sachawo unu,+ ma e dowo unu nsọ,+ ma a kpọwo unu ndị ezi omume+ n’aha Onyenwe anyị Jizọs Kraịst+ nakwa site ná mmụọ nke Chineke anyị.+
7 ka anyị wee ghọọ ndị nketa+ dị ka olileanya ndụ ebighị ebi si dị,+ mgbe a kpọsịworo anyị ndị ezi omume+ n’ihi obiọma na-erughịrị mmadụ nke onye ahụ.+