1 Ndị Kọrịnt
6 Ọ̀ dị onye ọ bụla n’ime unu nke ya na onye ọzọ sere okwu,+ nke ga-anwa anwa gaa n’ụlọikpe n’ihu ndị ajọ omume,+ n’abụghị n’ihu ndị nsọ?+ 2 Ka ọ̀ bụ na unu amaghị na ndị nsọ ga-ekpe+ ụwa+ ikpe? Ọ bụrụkwa na ọ bụ unu ga-ekpe ụwa ikpe, ọ̀ bụ na unu erughị eru ikpe ihe na-enweghị ihe ha bụ+ ikpe? 3 Ọ̀ bụ na unu amaghị na anyị ga-ekpe ndị mmụọ ozi ikpe?+ Gịnịzi mere na anyị agaghị ekpe ikpe n’okwu ikpe metụtara ndụ a? 4 Ya mere, ọ bụrụ na unu nwere okwu ikpe nke metụtara ndụ a,+ bụ́ nke a ga-eleba anya, ọ̀ bụ ndị ọgbakọ na-elelị ka unu mere ndị ikpe?+ 5 M na-ekwu ya ka ihere mee unu.+ Ọ̀ bụ eziokwu na ọ dịghị otu onye maara ihe+ n’etiti unu nke nwere ike ikpeziri nwanna na nwanna ibe ya? 6 Kama, nwanna na nwanna na-aga n’ụlọikpe, ya bụ, n’ihu ndị na-ekweghị ekwe.+
7 Ya mere, ọ pụtara na e meriwo unu ebe ọ bụ na unu na-akpụpụ ibe unu n’ụlọikpe.+ Gịnị mere unu ekweghị ka e mejọọ unu?+ Gịnị mere unu ekweghị ka e rigbuo unu?+ 8 Kama nke ahụ, ọ bụ ụmụnna unu+ ka unu na-emejọ, na-erigbukwa ha.
9 Gịnị? Ọ̀ bụ na unu amaghị na ndị ajọ omume agaghị eketa alaeze Chineke?+ Unu ekwela ka e duhie unu. Ndị na-akwa iko,+ ma ọ bụ ndị na-ekpere arụsị,+ ma ọ bụ ndị bụ́ di ma ọ bụ nwunye na-akwa iko,+ ma ọ bụ ndị ikom ndị na-ekwe ka ndị ikom dinaa ha,+ ma ọ bụ ndị ikom na-edina ndị ikom,+ 10 ma ọ bụ ndị ohi, ma ọ bụ ndị anyaukwu,+ ma ọ bụ ndị aṅụrụma,+ ma ọ bụ ndị na-ekwujọ mmadụ, ma ọ bụ ndị na-apụnara mmadụ ihe, agaghị eketa alaeze Chineke.+ 11 Ma nke ahụ bụkwa ihe ụfọdụ n’ime unu bụbu.+ Ma a sachawo unu,+ ma e dowo unu nsọ,+ ma a kpọwo unu ndị ezi omume+ n’aha Onyenwe anyị Jizọs Kraịst+ nakwa site ná mmụọ nke Chineke anyị.+
12 N’ebe m nọ, iwu kwadoro ihe niile; ma ọ bụghị ihe niile bara uru.+ N’ebe m nọ, iwu kwadoro ihe niile;+ ma agaghị m ekwe ka ihe ọ bụla na-achị m.+ 13 Ihe oriri dịịrị afọ, afọ dịkwaara ihe oriri;+ ma Chineke ga-ebibi ma afọ ma ihe oriri.+ Ahụ́ adịrịghị ịkwa iko, kama ọ dịịrị Onyenwe anyị;+ Onyenwe anyị dịkwaara ahụ́.+ 14 Ma Chineke kpọlitere Onyenwe anyị+ n’ọnwụ, ọ ga-akpọlitekwa anyị n’ọnwụ+ site n’ike ya.+
15 Ọ̀ bụ na unu amaghị na ahụ́ unu bụ akụkụ ahụ́+ nke Kraịst?+ M̀ ga-ewepụzi akụkụ ahụ́ Kraịst ma mee ka ọ bụrụ akụkụ ahụ́ nke nwaanyị akwụna?+ Tụfịakwa! 16 Gịnị? Ọ̀ bụ na unu amaghị na onye e jikọrọ ya na nwaanyị akwụna, ya na ya bụ otu ahụ́? N’ihi na ọ sịrị, “Ha abụọ ga-abụ otu anụ ahụ́.”+ 17 Ma onye e jikọrọ ya na Onyenwe anyị, ya na ya bụ otu+ mmụọ.+ 18 Gbaaranụ ịkwa iko ọsọ.+ Mmehie ọ bụla ọzọ nke mmadụ pụrụ ime dị n’elu ahụ́ ya, ma onye na-akwa iko na-emehie megide ahụ́ nke ya.+ 19 Gịnị? Ọ̀ bụ na unu amaghị na ahụ́ unu bụ ụlọ nsọ+ nke mmụọ nsọ, nke dị n’ime unu,+ nke unu nwetara n’aka Chineke? Ọ bụghịkwa unu nwe onwe unu,+ 20 n’ihi na e ji ihe dị oké ọnụ ahịa zụta unu.+ Ya mere, jirinụ ahụ́ unu+ na-enye Chineke otuto.+