14 Onye ọ bụla ṅụrụ mmiri nke m ga-enye ya, akpịrị agaghị akpọ ya nkụ ma ọlị,+ kama mmiri nke m ga-enye ya ga-aghọ n’ime ya isi iyi nke mmiri+ na-asụpụta asụpụta inye ndụ ebighị ebi.”+
37 Ma n’ụbọchị ikpeazụ, bụ́ oké ụbọchị n’ememme ahụ,+ Jizọs guzoro ọtọ, o wee tie mkpu, sị: “Ọ bụrụ na akpịrị na-akpọ onye ọ bụla nkụ,+ ya bịakwute m ṅụọ mmiri.
17 Mmụọ nsọ+ na nwaanyị ahụ a na-alụ ọhụrụ+ na-asị: “Bịa!” Onye ọ bụla nke nụrụ ya, ya sịkwa: “Bịa!”+ Onye ọ bụla nke akpịrị na-akpọ nkụ, ya bịakwa;+ onye ọ bụla nke chọrọ, ya nara mmiri nke ndụ ahụ n’efu.+