14 Onye ọ bụla ṅụrụ mmiri nke m ga-enye ya, akpịrị agaghị akpọ ya nkụ ma ọlị,+ kama mmiri nke m ga-enye ya ga-aghọ n’ime ya isi iyi nke mmiri+ na-asụpụta asụpụta inye ndụ ebighị ebi.”+
35 Jizọs sịrị ha: “Abụ m achịcha na-enye ndụ. Onye na-abịakwute m, agụụ agaghị agụ ya ma ọlị, onye nwekwara okwukwe n’ebe m nọ, akpịrị agaghị akpọ ya nkụ ma ọlị.+
17 Mmụọ nsọ+ na nwaanyị ahụ a na-alụ ọhụrụ+ na-asị: “Bịa!” Onye ọ bụla nke nụrụ ya, ya sịkwa: “Bịa!”+ Onye ọ bụla nke akpịrị na-akpọ nkụ, ya bịakwa;+ onye ọ bụla nke chọrọ, ya nara mmiri nke ndụ ahụ n’efu.+