3Ànyị na-amaliteghachi ikwu okwu ọma banyere onwe anyị?+ Ka ọ̀ dị anyị mkpa, ma eleghị anya, dị ka ọ dị ndị ụfọdụ, idetara unu akwụkwọ ozi,+ ma ọ bụ ịnata akwụkwọ ozi nkọwa n’aka unu?
12 Anyị adịkwaghị agwa unu okwu ọma+ banyere onwe anyị, kama anyị na-enye unu ihe ga-akpali unu iji anyị na-anya isi,+ ka unu wee nwee ihe unu ga-aza ndị na-anya isi n’ihi otú mmadụ dị n’elu ahụ́+ kama ịnya isi n’ihi otú obi mmadụ dị.+