28 Na-elezinụ+ onwe unu+ na ìgwè atụrụ+ ahụ dum anya, nke mmụọ nsọ họpụtara unu ka unu bụrụ ndị na-elekọta ya,+ ka unu na-azụ ọgbakọ Chineke dị ka atụrụ,+ nke o ji ọbara+ Ọkpara ya zụta.
25 Chineke wepụtara ya dị ka àjà ime udo;+ udo a na-abịa site n’inwe okwukwe n’ọbara ya.+ Nke a bụ iji gosi ezi omume nke ya, n’ihi na ọ na-agbaghara mmehie+ ndị e mere n’oge gara aga mgbe Chineke nọ na-enwe ndidi;+
9 Ha na-abụkwa abụ ọhụrụ,+ sị: “I kwesịrị ịnara akwụkwọ mpịakọta ahụ ma meghee ihe ndị a kara akara e ji mechie ya, n’ihi na e gburu gị egbu, i jikwa ọbara gị+ zụtara+ Chineke ndị mmadụ+ si n’ebo niile na asụsụ niile na ndị niile na mba niile,