11 N’ihi nsogbu nke mkpụrụ obi ya, ihe ọ ga-ahụ+ ga-eju ya afọ.+ Site n’ihe onye ezi omume ahụ, bụ́ ohu m,+ maara, ọ ga-eme ka ọtụtụ ndị ghọọ ndị ezi omume;+ ọ ga-eburukwa njehie ha.+
19 ya bụ, na Chineke si n’aka Kraịst+ na-eme ka ya+ na ụwa+ dị ná mma, n’agụrụghị ha njehie ha,+ o nyefekwara n’aka anyị okwu+ nke ime ka a dị ná mma.+
10 Ịhụnanya ahụ si otú a dịrị, ọ bụghị na ọ bụ anyị hụrụ Chineke n’anya, kama na ọ bụ ya hụrụ anyị n’anya wee zite Ọkpara ya ka ọ bụrụ àjà+ ime udo+ maka mmehie anyị.+