15 “Ọ ga-egbu mkpi àjà mmehie ahụ, nke bụ́ maka ụmụ Izrel,+ ọ ga-ewebata ọbara ya n’ime ákwà mgbochi+ ahụ ma were ọbara ya+ mee otu ihe ahụ o ji ọbara oké ehi ahụ mee; ọ ga-efesakwa ya n’ihu ihe mkpuchi ahụ.
28 Dị nnọọ ka Nwa nke mmadụ bịara, ọ bụghị ka e jeere ya ozi, kama ka o jee ozi,+ ka o nyekwa mkpụrụ obi ya ka ọ bụrụ ihe mgbapụta n’ọnọdụ ọtụtụ mmadụ.”+
16 “Enwekwara m atụrụ ọzọ,+ ndị na-anọghị n’ogige atụrụ a;+ m ga-akpọtakwa ha, ha ga-ege ntị n’olu m,+ ha ga-aghọ otu ìgwè atụrụ, nweekwa otu onye ọzụzụ atụrụ.+
14 M wee sị ya ozugbo: “Onyenwe m, ọ bụ gị onwe gị maara.” O wee sị m: “Ndị a bụ ndị si n’oké mkpagbu ahụ pụta,+ ha asawokwa uwe mwụda ha, meekwa ka ọ na-acha ọcha+ n’ime ọbara+ Nwa Atụrụ ahụ.