Matiu
20 “N’ihi na alaeze eluigwe dị ka otu onye nke bụ́ onyeisi ezinụlọ, onye pụrụ n’isi ụtụtụ ịga goo ndị ga-arụrụ ya ọrụ n’ubi vaịn ya.+ 2 Mgbe ya na ndị ọrụ ahụ kwekọrịtara na ọ ga-akwụ ha otu mkpụrụ ego dinarịọs maka otu ụbọchị,+ o zigara ha n’ubi vaịn ya. 3 Mgbe ọ pụkwara n’ihe dị ka n’awa nke atọ,*+ ọ hụrụ ndị ọzọ ka ha guzo n’ọma ahịa+ n’enweghị ọrụ; 4 o wee sị ha, ‘Unu onwe unu, gaanụ n’ubi vaịn m, ihe ọ bụla kwesịrị ekwesị ka m ga-enye unu.’ 5 Ha wee gawa. Ọ pụrụ ọzọ n’ihe dị ka n’awa nke isii*+ nakwa n’awa nke itoolu*+ wee mee otu ihe ahụ. 6 N’ikpeazụ, ọ pụrụ n’ihe dị ka n’awa nke iri na otu* wee hụ ka ndị ọzọ guzo, o wee sị ha, ‘Gịnị mere unu ji guzo n’ebe a ụbọchị dum n’enweghị ọrụ?’ 7 Ha sịrị ya, ‘N’ihi na ọ dịghị onye goro anyị ọrụ.’ O wee sị ha, ‘Unu onwe unu, gaanụ n’ubi vaịn m.’+
8 “Mgbe o ruru uhuruchi,+ onye nwe ubi vaịn ahụ gwara onye na-elekọtara ya ọrụ, sị, ‘Kpọọ ndị ọrụ ahụ, kwụọ ha ụgwọ ọrụ ha,+ malite n’onye ikpeazụ ruo n’onye mbụ.’ 9 Mgbe ndị awa nke iri na otu bịara, onye ọ bụla n’ime ha natara otu mkpụrụ ego dinarịọs. 10 Ya mere, mgbe ndị mbụ bịara, ha chere na ha ga-anata nke ka ukwuu; ma ha natakwara ụgwọ ọrụ nke bụ́ otu mkpụrụ ego dinarịọs. 11 Mgbe ha natara ya, ha malitere ịtamu ntamu megide onyeisi ezinụlọ ahụ+ 12 wee sị, ‘Ndị ikpeazụ a rụrụ ọrụ otu awa; n’agbanyeghị nke ahụ, i mere ka anyị na ha hara nhata, anyị ndị nọ na-adọgbu onwe anyị n’ọrụ kemgbe ụtụtụ n’anwụ!’ 13 Ma ọ zara otu onye n’ime ha, sị, ‘Enyi, ọ dịghị ihe ọjọọ m mere gị. I kwere na m ga-akwụ gị otu mkpụrụ ego dinarịọs, ka ọ̀ bụ na i kweghị?+ 14 Nara ihe bụ́ nke gị lawa. Achọrọ m inye onye ikpeazụ a otu ihe ahụ m nyere gị.+ 15 Iwu ọ́ kwadoghị ka m jiri ihe ndị bụ́ nke m mee ihe m chọrọ? Ka ị̀ na-emere m anyaụfụ*+ maka na m bụ ezi mmadụ?’+ 16 Otú a, ndị ikpeazụ ga-abụ ndị mbụ, ndị mbụ ga-abụkwa ndị ikpeazụ.”+
17 Mgbe Jizọs chọrọ ịgbago Jeruselem, ọ kpọpụrụ mmadụ iri na abụọ ahụ na-eso ụzọ ya iche,+ wee gwa ha n’okporo ụzọ, sị: 18 “Lee! Anyị na-agbago Jeruselem, a ga-enyefe Nwa nke mmadụ n’aka ndị isi nchụàjà na ndị odeakwụkwọ, ha ga-amakwa ya ikpe ọnwụ,+ 19 ha ga-enyefekwa ya n’aka ndị mba ọzọ ka ha were ya mee ihe ọchị, pịakwa ya ihe ma kpọgide ya n’osisi,+ n’ụbọchị nke atọ, a ga-akpọlite ya.”+
20 Nne ụmụ Zebedi+ wee bịakwute ya, ya na ụmụ ya ndị ikom, kpọọrọ ya isiala ma rịọ ya ka o meere ya ihe.+ 21 Ọ sịrị ya: “Gịnị ka ị chọrọ?” Nwaanyị ahụ wee sị ya: “Kwuo ka ụmụ m ndị ikom abụọ a nọdụ ala, otu onye n’aka nri gị, otu onye n’aka ekpe gị, n’alaeze gị.”+ 22 Jizọs wee zaa, sị: “Unu amaghị ihe unu na-arịọ. Ùnu pụrụ ịṅụ iko+ nke m na-aga ịṅụ?” Ha sịrị ya: “Anyị pụrụ ịṅụ ya.” 23 O wee sị ha: “Unu ga-aṅụ iko m,+ ma ọ bụghị m na-eme ka a nọdụ n’aka nri m na n’aka ekpe m, kama ọ dịịrị ndị Nna m kwadebeere ya.”+
24 Mgbe mmadụ iri ndị nke ọzọ nụrụ ihe a, ha wesoro ụmụnne abụọ ahụ iwe.+ 25 Ma mgbe Jizọs kpọrọ ha ka ha bịakwute ya, ọ sịrị: “Unu maara na ndị na-achị ndị mba ọzọ na-eme ha ka ọ̀ bụ ha nwe ha, ndị ukwu ha na-achịkwa ha n’aka ike.+ 26 O kwesịghị ịdị otú ahụ n’etiti unu;+ kama onye ọ bụla nke na-achọ ịbụ onye ukwu n’etiti unu aghaghị ịbụ onye na-ejere unu ozi,+ 27 onye ọ bụla nke na-achọkwa ịbụ onye mbụ n’etiti unu aghaghị ịbụ ohu unu.+ 28 Dị nnọọ ka Nwa nke mmadụ bịara, ọ bụghị ka e jeere ya ozi, kama ka o jee ozi,+ ka o nyekwa mkpụrụ obi ya ka ọ bụrụ ihe mgbapụta n’ọnọdụ ọtụtụ mmadụ.”+
29 Mgbe ha si Jeriko na-apụ,+ oké ìgwè mmadụ sooro ya. 30 Ma, lee! Mgbe ndị ìsì abụọ ndị nọ ọdụ n’akụkụ okporo ụzọ nụrụ na ọ bụ Jizọs na-agafe, ha tiri mkpu, sị: “Onyenwe anyị, meere anyị ebere, Nwa Devid!”+ 31 Ma ìgwè mmadụ ahụ gwasiri ha ike ka ha mechie ọnụ; ma ha tisikwuru mkpu ike, sị: “Onyenwe anyị, meere anyị ebere, Nwa Devid!”+ 32 Jizọs wee kwụsị, kpọọ ha, sị: “Gịnị ka unu chọrọ ka m meere unu?” 33 Ha sịrị ya: “Onyenwe anyị, ka e meghee anya anyị.”+ 34 N’ihi ọmịiko Jizọs nwere, o bitụrụ ha aka n’anya,+ ha wee hụwa ụzọ ozugbo wee soro ya.+