5 Ma a mara ya ube+ n’ihi mmebi iwu anyị;+ a nọkwa na-echi ya ọnụ n’ala n’ihi njehie anyị.+ A pịara ya ụtarị nke ga-eme ka anyị nwee udo,+ a gwọrọ anyị+ n’ihi ọnyá ya.+
15 Okwu a+ kwesịrị ntụkwasị obi, kwesịkwa ka a nabata ya n’ụzọ zuru ezu, ya bụ, na Kraịst Jizọs bịara n’ụwa ịzọpụta ndị mmehie.+ N’ime ndị a, abụ m onye mbụ.+
24 Ya onwe ya buuru mmehie anyị+ n’ahụ́ ya n’elu osisi ahụ,+ ka anyị wee sepụ aka ná mmehie+ ma bie ndụ n’ezi omume. Ọ bụkwa “site n’ọnyá ya ka a gwọrọ unu.”+