18 N’ihi na ụdị ndị dị otú ahụ abụghị ndị ohu nke Onyenwe anyị Kraịst, kama ha bụ ndị ohu nke afọ ha;+ sitekwa n’okwu ire ụtọ+ na okwu ịja mma,+ ha na-arafu obi nke ndị na-adịghị aghụghọ.
6 Unu ekwela ka mmadụ ọ bụla jiri okwu efu ghọgbuo unu,+ n’ihi na ọ bụ n’ihi ihe ndị ahụ e bu ụzọ kwuo ka ọnụma nke Chineke na-abịakwasị ụmụ nnupụisi.+
14 Ha nwere anya jupụtara n’ịkwa iko,+ ha enweghị ike isepụ aka ná mmehie,+ ha na-aratakwa mkpụrụ obi ndị na-akwụsighị ike. Ha nwere obi a zụrụ azụ n’anyaukwu.+ Ha bụ ụmụ a bụrụ ọnụ.+