18 ebe e meworo ka anya+ nke obi unu hụ ìhè,+ ka unu wee mara ihe bụ́ olileanya+ ahụ bụ nke ọ kpọrọ unu ka unu nweta, ihe bụ́ akụ̀ ahụ dị ebube,+ nke ọ ga-enye ndị nsọ+ dị ka ihe nketa,
8 Malite ugbu a gaa n’ihu, e debeere m okpueze ezi omume,+ nke Onyenwe anyị, bụ́ onyeikpe ezi omume,+ ga-enye m dị ka ụgwọ ọrụ+ n’ụbọchị ahụ,+ ma ọ bụghị naanị m, kamakwa ndị niile na-atụsi anya ike ka ọ pụta ìhè.