Diuterọnọmi 19:15 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 15 “Naanị otu onye akaebe agaghị ebili gbagide mmadụ akaebe n’ihe metụtara njehie ọ bụla ma ọ bụ mmehie ọ bụla,+ n’ihe banyere mmehie ọ bụla o mere. N’ọnụ ndị akaebe abụọ ma ọ bụ n’ọnụ ndị akaebe atọ ka a ga-ama na okwu bụ eziokwu.+ Matiu 18:16 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 16 Ma ọ bụrụ na o geghị ntị, kpọrọ otu onye ma ọ bụ mmadụ abụọ ọzọ, ka e wee site n’ọnụ ndị akaebe abụọ ma ọ bụ atọ mara na okwu ọ bụla bụ eziokwu.+ 2 Ndị Kọrịnt 13:1 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 13 Nke a bụ nke ugboro atọ+ m na-abịakwute unu. “A ga-amara na okwu ọ bụla bụ eziokwu n’ọnụ ndị akaebe abụọ ma ọ bụ atọ.”+ Ndị Hibru 10:28 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 28 A na-egbu onye ọ bụla ledara iwu Mozis anya n’enweghịrị ya ọmịiko, mgbe mmadụ abụọ ma ọ bụ atọ gbagidere ya akaebe.+
15 “Naanị otu onye akaebe agaghị ebili gbagide mmadụ akaebe n’ihe metụtara njehie ọ bụla ma ọ bụ mmehie ọ bụla,+ n’ihe banyere mmehie ọ bụla o mere. N’ọnụ ndị akaebe abụọ ma ọ bụ n’ọnụ ndị akaebe atọ ka a ga-ama na okwu bụ eziokwu.+
16 Ma ọ bụrụ na o geghị ntị, kpọrọ otu onye ma ọ bụ mmadụ abụọ ọzọ, ka e wee site n’ọnụ ndị akaebe abụọ ma ọ bụ atọ mara na okwu ọ bụla bụ eziokwu.+
13 Nke a bụ nke ugboro atọ+ m na-abịakwute unu. “A ga-amara na okwu ọ bụla bụ eziokwu n’ọnụ ndị akaebe abụọ ma ọ bụ atọ.”+
28 A na-egbu onye ọ bụla ledara iwu Mozis anya n’enweghịrị ya ọmịiko, mgbe mmadụ abụọ ma ọ bụ atọ gbagidere ya akaebe.+