14 ka anyị wee ghara ịbụkwa ụmụ ọhụrụ, ndị ebili mmiri na-enugharị+ na ndị ifufe ozizi ọ bụla+ na-ebugharị, site n’aghụghọ+ nke ụmụ mmadụ, site ná njehie e ji aghụghọ chepụta.
8 Nọrọnụ na nche: ma eleghị anya, a pụrụ inwe onye ga-eburu+ unu dị ka anụ oriri ya site na nkà ihe ọmụma+ na aghụghọ efu,+ dị ka ọdịnala mmadụ si dị, dị ka ihe ndị mbụ+ nke ụwa si dị, ọ bụghị dị ka Kraịst si dị;
2 ka unu ghara ikwe ka e mee ka unu maa jijiji ọsọ ọsọ wee bụrụ ndị na-enweghị uche ma ọ bụ bụrụ ndị a kpaliri site n’okwu nke si n’aka mmụọ+ ma ọ bụ site n’ozi ọnụ+ ma ọ bụ site n’akwụkwọ ozi+ nke yiri ka ò si n’aka anyị, ime ka unu chee na ụbọchị+ Jehova abịawo.