13 “Anọ m na-ahụ n’ọhụụ m hụrụ n’abalị, ma, lee! onye yiri nwa nke mmadụ+ nọ na-abịa n’ígwé ojii+ nke eluigwe; ọ banyere n’ebe Onye Ochie ahụ+ nọ, ha wee kpọrọ ya bịa nso n’ihu Onye ahụ.+
64 Jizọs sịrị+ ya: “Ọ bụ gị kwuru ya.+ Ma ana m asị unu, Site ugbu a+ gaa n’ihu, unu ga-ahụ Nwa nke mmadụ+ ka ọ nọ ọdụ n’aka nri+ nke ike ma na-abịa n’ígwé ojii nke eluigwe.”+
11 ha wee sị: “Ndị Galili, gịnị mere unu ji guzoro na-ele anya na mbara igwe? Jizọs a, onye e si n’ebe unu nọ kpọgoro na mbara igwe, ga-esi otú a bịa,+ ya bụ, n’otu ụzọ ahụ unu hụrụ ya ka ọ na-abanye na mbara igwe.”
17 E mesịa, anyị onwe anyị bụ́ ndị dị ndụ, ndị a hapụrụ, a ga-eburu+ anyị na ha+ gaa n’ígwé ojii+ izute+ Onyenwe anyị na mbara igwe; otú a ka anyị na Onyenwe anyị ga-anọ mgbe niile.+
14 M wee hụ, ma, lee! igwe ojii na-acha ọcha, na otu onye nke yiri nwa nke mmadụ+ nke nọ n’elu ígwé ojii ahụ, o kpukwa okpueze ọlaedo+ n’isi ya, mma owuwe ihe ubi nke dị nkọ dịkwa n’aka ya.