8 M nọ na-eche banyere mpi ndị ahụ, ma, lee! mpi ọzọ, nke dị ntakịrị,+ pulitere n’etiti ha, e fopụkwara atọ n’ime mpi ndị mbụ ahụ n’ihu ya. Ma, lee! e nwere anya ndị yiri anya mmadụ na mpi a, e nwekwara ọnụ nke na-etu ọnụ.+
13 M wee hụ okwu atọ na-adịghị ọcha ndị si n’aka mmụọ,+ bụ́ ndị yiri mbàrá,+ ka ha si n’ọnụ dragọn+ ahụ na n’ọnụ anụ ọhịa ahụ+ na n’ọnụ onye amụma ụgha ahụ+ pụta.
20 E wee jide anụ ọhịa ahụ,+ ya na onye amụma ụgha+ ahụ nke mere ihe ịrịba ama+ ndị ahụ n’ihu ya, bụ́ ndị o ji duhie ndị natara akara+ nke anụ ọhịa ahụ na ndị na-efe onyinyo ya ofufe.+ Mgbe ha ka nọ ndụ, a tụbara ha abụọ n’ime ọdọ ọkụ ahụ nke ji sọlfọ na-enwu.+