26 Job wee zaa, sị:
2 “Leenụ ụdị aka ị na-enyere onye na-enweghị ike!
Lee ka i si zọpụta ogwe aka nke na-enweghị ume!+
3 Leenụ ụdị ndụmọdụ i nyere onye na-amaghị ihe,+
Meekwa ka ọtụtụ mmadụ mara ihe bụ́ ezi amamihe!
4 Ònye ka ị na-agwa?
Ọ̀ bụkwa onye ziri gị ihe ị na-ekwu?
5 Ndị na-adịghị ndụ na-ama jijiji
N’ala mmiri, tinyere ihe ndị bi n’ime ya.+
6 Shiol gba ọtọ n’ihu ya,+
Ebe mbibi enweghịkwa ihe mkpuchi.
7 Ọ na-esetị ebe ugwu n’elu ebe tọgbọrọ chakoo,+
Ọ dịghịkwa ihe o kokwasịrị ụwa na ya;
8 O ji ígwé ojii ya kechie mmiri,+
Nke mere na ọ dịghị anyịwa ígwé ojii;
9 Ọ na-ekpuchi ihu ocheeze ya,
Gbasaa ígwé ojii ya n’elu ya.+
10 Ọ kpawo ókè okirikiri n’elu mmiri,+
Ruo n’ókè nke ìhè na ọchịchịrị.
11 Ogidi eluigwe na-amacha jijiji,
Ịba mba ya na-eju ha anya.
12 O jiriwo ike ya mee ka oké osimiri mee mkpatụ,+
O jiriwokwa nghọta ya kụrie+ ihe na-eme ihe ike.+
13 O jiriwo ifufe ya mee ka eluigwe na-egbukepụ egbukepụ,+
Aka ya amagbuwo agwọ na-amịgharị amịgharị.+
14 Lee! Ihe ndị a bụ ntakịrị ihe n’ọrụ ya niile,+
Leekwa ka ihe a nụworo banyere ya si dị ntakịrị!
Ma ònye pụrụ ịghọta ụzọ égbè eluigwe ya nke dị ike?”+