-
Ndị Hibru 9:4, 5Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
4 Ihe dị ná nkebi a bụ ihe e ji ọlaedo mee e ji etinye insens*+ nakwa igbe ọgbụgba ndụ+ nke e ji ọlaedo machie ahụ́ ya niile.+ Ihe ndị dị n’ime igbe ọgbụgba ndụ ahụ bụ ite ọlaedo nke mana dị n’ime ya,+ mkpanaka Erọn nke wara okooko,+ na mbadamba nkume abụọ+ e dere ihe Chineke na ndị Izrel gbara ná ndụ. 5 N’elu igbe ahụ, e nwere ndị cherob dị ebube, ndị ji nku ha sachie okwuchi igbe ahụ.*+ Ma ihe a abụghị oge a ga-ekwucha ihe niile gbasara ihe ndị a.
-