-
Levitikọs 16:18, 19Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
18 “Ọ ga-apụta gaa n’ebe ịchụàjà+ nke dị n’ihu Jehova ma kpuchiere ebe ịchụàjà ahụ mmehie. Ọ ga-eweretụ ọbara oké ehi ahụ, weretụkwa ọbara mkpi ahụ ma tee ha na mpi ndị dị n’ebe ịchụàjà ahụ, n’akụkụ ya niile. 19 Ọ ga-ejikwa mkpịsị aka ya fesa ọbara ahụ n’elu ya ugboro asaa wee mee ka ọ dị ọcha, dookwa ya nsọ n’ihi ihe ndị Izrel, bụ́ ndị na-adịghị ọcha, mere.
-