-
Ọpụpụ 29:1, 2Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
29 “Otú a ka ị ga-esi eme ka ha dị nsọ, ka ha wee bụrụ ndị nchụàjà m: Kpụrụ oké ehi, ebule abụọ ahụ́ dị mma,+ 2 werekwa achịcha na-ekoghị eko, ogbe achịcha ndị na-ekoghị eko dị okirikiri a gwara mmanụ, nakwa achịcha ndị na-ekoghị eko dị fere fere a wụrụ mmanụ.+ Ị ga-eji ntụ ọka wit e gwere nke ọma mee ha
-
-
Ọpụpụ 29:40, 41Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
40 Ihe ndị ị ga-eji chụọ ebule nke mbụ n’àjà bụ otu ụzọ n’ụzọ iri nke otu efa* ntụ ọka e gwere nke ọma, nke a gwara otu ụzọ n’ụzọ anọ nke otu hin* mmanụ oliv, nakwa otu ụzọ n’ụzọ anọ nke otu hin mmanya nke ga-abụ àjà mmanya. 41 Ị ga-achụ ebule nke abụọ n’àjà ná mgbede.* Ị ga-eji àjà ọka na àjà mmanya ga-adị ka nke ụtụtụ chụọ ya. Ị ga-achụ ya n’àjà ka ọ bụrụ ihe na-esi ísì ọma,* bụ́ àjà a na-esu ọkụ nke a na-achụrụ Jehova.
-