12 Mosis wee gwa Erọn na Elieza na Ịtama, bụ́ ụmụ Erọn ndị nwoke fọrọnụ, sị: “Werenụ ihe fọrọ n’àjà ọka e suru ọkụ a chụụrụ Jehova mee achịcha na-ekoghị eko, nọrọkwanụ n’ebe dị nso n’ebe ịchụàjà rie ya,+ n’ihi na ọ bụ ihe kacha nsọ.+
9 Ihe ndị a ga-abụ nke gị n’ime àjà ndị kacha nsọ a na-esu ọkụ: àjà ọ bụla ha na-achụ, ma àjà ọka ha+ ma àjà mmehie ha+ ma àjà ikpe ọmụma ha,+ bụ́ ndị ha na-ewetara m. Ọ ga-abụrụ gị na ụmụ gị ndị nwoke ihe kacha nsọ.