-
Levitikọs 6:20, 21Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
20 “Ihe a bụ àjà Erọn na ụmụ ya ndị nwoke ga-achụrụ Jehova n’ụbọchị a ga-ete ya mmanụ:+ otu ụzọ n’ụzọ iri nke otu efa*+ ntụ ọka e gwere nke ọma ka ọ bụrụ àjà ọka a na-achụ mgbe niile.+ A chụọ ọkara ya n’ụtụtụ, a chụọ ọkara ya ná mgbede. 21 A ga-agwa ya mmanụ ma mee ya n’ite dị mbadamba.+ Ị ga-eji mmanụ gwọọ ya nke ọma, nyawasịa ya iberibe iberibe ma weta ya ka ọ bụrụ àjà ọka, ka ọ bụrụ àjà na-esi ísì ọma* a na-achụrụ Jehova.
-