10 Erọn ga-achụ àjà ikpuchi mmehie n’elu mpi ndị dị na ya otu ugboro n’afọ.+ Ọ ga na-eji ọbara anụ e ji achụ àjà mmehie achụ àjà ikpuchi mmehie maka ya+ otu ugboro n’afọ n’ọgbọ unu niile. Ọ* bụ ihe kacha nsọ n’anya Jehova.”
7 Ma, ọ bụ naanị nnukwu onye nchụàjà na-abanye ná nkebi nke abụọ. Ọ na-abanye na ya otu ugboro n’afọ.+ O mekataghị banye ma ọ bụrụ na o jighị ọbara+ o ji achụ àjà maka mmehie ya+ nakwa maka mmehie ndị Izrel+ mere n’amaghị ụma.