17 “Mesienụ ndị Midian ike, gbuokwanụ ha,+ 18 n’ihi na ha ji aghụghọ na-emesi unu ike, mee ka unu fee Bel nke Piọ,+ nakwa n’ihi ihe Kọzbaị nwanne ha nwaanyị, nwa otu onyeisi ndị Midian, mere. E gburu ya+ n’ụbọchị ahụ unu rịara ọrịa ọjọọ maka na unu fere Bel nke Piọ.”+