25Mgbe ndị Izrel bi na Shitim,+ ha na ụmụ nwaanyị Moab malitere ịkwa iko.+2 Ụmụ nwaanyị ahụ kpọrọ ndị Izrel ka ha soro ha gaa chụọrọ chi ha àjà.+ Ndị Izrel wee malite iri ihe ha ji chụọ àjà ma na-akpọrọ chi ha isiala.+
14 “‘Ma, ihe ole na ole unu na-eme na-adịghị mụ mma bụ na unu kwere ka unu na ndị nabatara ihe Belam kụziri nọrọ.+ Ọ bụ Belam kụziiri Belak+ otú a ga-esi rata ndị Izrel ka ha mehie, rie ihe e ji chụọrọ arụsị àjà, kwaakwa iko.*+